|
1
|
|
|
2
|
- Idioms are like the source with which Igbo people eat expressions.
- Ilu bu mmanụ igbo ji eri okwu.
|
|
3
|
- A small masquerade is powerful because a big masquerade is not
around.
- Ọbere mmanwụ na-akpa ike maka na ijere anọghi nso.
|
|
4
|
- He who abhors dog meat should not elect to drink the soup.
- Onye si na ya anaghi ata anụ nkita, ya a hara kwana mmiri ọfe
ya.
|
|
5
|
- By the smell of fart you know the taste of the faeces.
- Eji isi arọ ama ụtọ nsii
|
|
6
|
- The ocean never drowns a person with whose leg it does not come in
contact.
- Oke oshimmiri anọkataghị rie onye ọbụna nke
ọ na-ahụghị ahụ ụkwụ ya anya..
|
|
7
|
- The catfish swam the ocean and swam the sea, but drowned in a soup pot.
- Ogwuna gwuru mmiri ukwu, gwukwa mmirri nta, ma lagbuo n'ite ofe.
|
|
8
|
- If you overlook a tiny pot, it will boil over and douse the fire.
- E nenie nwa ite, Ọ gbọnyụọ ọkụ.
|
|
9
|
- The tortoise that gears up to besides a river that drowned an elephant;
is it going to fly over this river or just jump over it?
- Mmiri riri enyi ka mbe hụrụ na-awa ọgọdọ;
ọ ga-efe mmiri a efe ka ọ ga-awụ ya awụ?
|
|
10
|
- The advice given to a child with a mother serves as the basis for an
orphan’s wisdom.
- Okwu agwara nwa nwere nne, ka nwa na-eweghị nne ji-mara ihe.
|
|
11
|
- You know the taste of faeces by the smell of fart.
- Eji isi arọ ama ụtọ nsi.
|
|
12
|
- When a goat is foraging on poison ivy, the kids watch her mouth.
- Nne ewu na-ata agbara, ụmụ ya a na-ele ya anya
n‘ọnụ.
|
|
13
|
- He who is hungry does not feed a deity.
- Onye na-erijughị afọ a naghị enye alụsị.
|
|
14
|
- The grasshopper scooped away by a hornbill is hard of hearing.
- Ụkpana okpoko buru nti chiri ya.
|
|
15
|
- If you tell a poor person what it takes to be rich, he chooses his
status.
- Agwa ụbịam ihe eji aba ọgaranya, ọ si ka ya
bụrụ ọgbenye ya bụ.
|
|
16
|
- One eyed man is king in the land of the blind.
- Onye otu anya na abụ eze n'ala ndi isi.
|
|
17
|
- For a closer look; the monkey got
bullet shot in it’s head.
- Ka ahụ na anya ka mgbọ ji atụa enwe n'isi
|
|
18
|
- Speaking of the priest(medicine man) that treats
cholera ; did he place his butt (portal of infection) up out of reach?
- Dibia na-agwọ otoro, ọ debere ike ya n'elu?
|
|
19
|
- He who has hear should hear.
- Ọnye nwere nti ya nụrụ
|
|
20
|
- If know how to pound do it in the mortar, if you don’t know then pound
on the floor.
- Ị mara asụ sụọ n'odo. Ị maghị
asụ sụọ n'ala.
|
|
21
|
- If you hint the wise they make use of it, but the fool will use it
foolishly.
- A tụọrọ ọ mara, ọ mara. Ma a
tụọrọ ọfeke, ọ fenye isi n’ọfia.
|
|
22
|
- Chicken chasers will fall but the chicken always gets away.
- Ọchụ ọkụkọ nwe ada. Nwa
ọkụkọ nwe nwanwa ọsọ.
|
|
23
|
- After polluting the Nwangene river, people end up drinking from it.
- Agbarụcha nwangene, e kuru ngene ńụa.
|
|
24
|
- When you are fast, you are more
likely to avoid problem.
- E mee ngwa ngwa, emeghara ọdachi.
|
|
25
|
- The bat recognizes that it is ugly, hence is it chooses to be nocturnal.
- Ụsụ ma ka ọ
jọrọ wee jiri uchichi aga
|
|
26
|
- The runner and the walker will end the same point.
- Ebe onye ọsọ ruru ka onye ije ga-eru.
|
|
27
|
- After growing to puberty the
damsel waits for her peers.
- Agbọghọbia tochaa ọ chere ibe ya.
|
|
28
|
- Let us keep offering sacrifice thereby passing the blame to the gods
(spirits).
- Ka ayi na-achụ aja ka ikpe na-ama ndi mụọ.
|
|
29
|
- A big yam tuber is beyond
roasting in fire.
- Mbaji na akari ịhụ n’ọkụ.
|
|
30
|
- He that is armed with good conscience will arrive home.
- O ji ọfọ ga-ala
|
|
31
|
- The Lion’s glory serves as a shield.
- Ebube agụ n’eche agu.
|
|
32
|
- For the cattle that has no tail, her god (guardian angel) wards off the
flies.
- Ehi enweghị ọdụ chi ya na achụrụ ya ijiji.
|
|
33
|
- The bird that flies from the ground and perches on an anthill is still
on the ground.
- Nnụnụ si n‘ala bee n'ikwube ka nọkwa n'ana.
|
|
34
|
- Where a child gets his mouth oily, that's where he hangs out.
- Ebe nwatakịrị na-ebuta ọnụ mmanụ ka
ọ na apụ ọrịrị.
|
|
35
|
- Those who loudly demand to be heard in a friendly gathering have been
bingeing on other people's booze.
- "IGBO KWENỤ" bụ na mmanya onye ọzọ.
|
|
36
|
- An old woman who has a permanent live-in helper says her lineage does
not grow old.
- Agadi nwaanyị nwere onye na-elekote ya anya sị na agbụrụ
ya adghị aka nka.
|
|
37
|
- Orkiri the bird says it seeks death (not bothered by death) but not from
a sling shot (catapult shot).
- Ọkịrị si na ya na-achọ ọnwụ, mana
ọ bụghị nke katapọọt.
|
|
38
|
- A subject that can not be freely discussed will not have q quick
closure.
- Okwu a na-asọ anya anaghị ebi gboo.
|
|
39
|
- Everyone blocks the breach in his
own fence.
- Ebe onye bi ka ọ na awachi
|
|
40
|
- When one is at home, he/she hollers.
- Onye nọrọ be ya, ọ na-aba
|
|
41
|
- The tortoise says that the luggage belongs to him that is why he caries
it on his back.
- Mbe si na ibu bụ nke ya, ya mere o ji kwọrọ ya
na-azụ
|
|
42
|
- Acknowledge the deaf; if the heavens don't hear, the earth will hear.
- Ka anyi kele onye nti chiri, ma elu anụghi, ala ga anụ.
|
|
43
|
- If the vulture fails so show up at the place of sacrifice, you know that
something is wrong in the land of the spirits.
- Achuọ aja, udele abịaghị, i mara na ihe mere bee ndi
mmuọ
|
|
44
|
- Preparing cocoyam for planting does not mean that they are already
planted.
- Mmecha ede abụghị ọkụkọ ya
|
|
45
|
- A mature eagle never fades.
- Ugo chara acha adịghị echu echu.
|
|
46
|
- By slow and steady pace you climb a hill.
- Nwanyọ nwanyọ k'eji ari ugwu.
|
|
47
|
- If a snake fails to live up to
it’s attributes, children will play with it.
- Agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ
ụmụ aka ewere ya gwurie egwu.
|
|
48
|
- When a child utters abomination, he thinks he has outspoken the elderly.
- Nwata kwuwa ọnụ ọ si na ya agwagbụe okenye na
okwu.
|
|
49
|
- It is okay to help ones self with a few palm nuts, but when you go
gathering with a basket, it becomes stealing.
- A kpara akwụ kpara akwụ,
Ewere nkata jee, ọ bụrụ oshi.
|
|
50
|
- There is no strength in being wasteful.
- Ejighi ntufu afụ ike.
|
|
51
|
- It is the domestic rat that showed the wild rat where to find the
hamper.
- Ọbụ ọke ụlọ gosiri ọke ọkwe
ebe ngiga di.
|
|
52
|
- The kite and the eagle should share the roost. Which ever that attempts
to deprive the other should loose its feathers.
- Egbe bere ugo bere, nke si ibe ya ebena nku kwa ya.
|
|
53
|
- Who ever fetches ant infested fire wood will the lizard as a guest
(hanging out).
- Onye kpata nkụ arụrụ ngwere apụkwụ te ya
ọrịrị.
|
|
54
|
- If someone has to explain a proverb to you, the dowry paid on your
mother was a waste.
- Nwatakịrị a tụrọ ilu, ma kọwakwara ya, ego
e ji wee lụo nne ya lara n'iyi
|
|
55
|
- Use your tongue to count your teeth.
- Were ire gi gụọ eze gi ọnụ.
|
|
56
|
- When one finger touches palm oil it contacts the mouth of every one.
- Otu nkpụrụ aka rụta mmanụ o zue ọha
ọnụ.
|
|
57
|
- Soiled hands bring forth, oily mouth.
- Aka aja aja n'ebute ọnụ mmanụ mmanụ.
|
|
58
|
- No one gets wealthy by throwing away what which they have acquired.
- E jighi akpata atufuo aba
ụba
|
|
59
|
- Bread fruit falls for those that do not know how to process it.
- Ụkwa n’adara ndi amaghị asa.
|
|
60
|
- The trumpeter occasionally wipes his mouth
- Ogbu opi na eficha ọnụ.
|
|
61
|
- The dog licks faeces, but the
teeth of the goat gets rotten.
- Nkita rachasia nsi, eze ere ewu.
|
|
62
|
- If you ignore faeces it smells.
- Agba nsị nkịtị ọ n’esi usi.
|
|
63
|
- The anus that farted is left alone but the head receives the
knock.(beating).
- Ahapụ otele nyụrụ ahụ, avụọ isi
ọkpọ
|
|
64
|
- Udara friut said she is only one
whose children get there lips squeezed.
- Ụdara si na ọ bụ sọsọ ya mụtara nwa
ana apiwa ọnụ
|
|
65
|
- Laughter does not translate to a good relationship
- Ọchị abụghị ụtọ
|
|
66
|
- The monkey's dexterity in jumping from tree to tree is because the tree
is close by.
- Enwe ma ka eji amagharị n'ọhịa bụ na osisi
dị ya nso.
|
|
67
|
- An old woman is never too old to perform her favorite dance step.
- Agadi nwanyị anaghị akaru nka na egwu ọ mara agba.
|
|
68
|
- Surprise make and break the brave
- Mberede nyịrị dike, mberede ka eji ama dike
|
|
69
|
- After flying the termite will fall to be eaten by the toad.
- Akụ fecha ọ dara awọ.
|
|
70
|
- A woman that prepares soup with ogiri (fowl smelling spice) is familiar
with house fly.
- Nwanyị na ete ofe ogiri mara ijiji anya mbịa.
|
|
71
|
- If the right hand scrubs the left, the left hand will in turn scrub the
right
- Akanri kwọ aka ekpe , aka ekpe akwọ aka nri.
|
|
72
|
- When the hill learns to cause waist pain the old lady learns to rest
intermittently.
- Ugwu mụta mgbaji ukwu, Agadi nwanyị amụta agakata ezue
ike.
|
|
73
|
- A sheep that is eager to grow horn should ask the ran how its neck feels
- Atụrụ na-achọ ipu mpi jee jụa ebune ka ekwo
dị ya.
|
|
74
|
- No one swallows phlegm to appease the pangs of hunger.
- Anaghị eji na agụụ na-agụ elo ụkwara.
|
|
75
|
- Where as not every one has an equal share of sickness those with scrotal
hernia are also getting bloated.
- A na-ekwu na ọrịa ezughị oke, ndị dara ibi ana
etokwu afọ.
|
|
76
|
- You know a fully ripe corn cub by the looks.
- A na-eji anya ama ọka chara acha.
|
|
77
|
- What the elderly sees while seating may not be seen by a child though he
climbs to heights.
- Ihe okenye nọ n'ala were hụ, nwata rigoro n’elu, ọ
gaghị ahụ ya.
|
|
78
|
- The traveller has more knowledge than the gray haired.
- Onye nje nje ka onye isi awọ mara ihe.
|
|
79
|
- The unimaginable will happen.
- Ebenebe ga-egbu
|
|
80
|
- Round and round you go the pepper plant you don't climb it.
- okirikiri ka na gba ukwu ose. Adịghị arị ya elu.
|
|
81
|
- Those that go out to defecate at night see the ghosts’ grasshoppers.
- Ndi na-eje mposi abalị na-ahụ ụkpana ndị
mmụọ.
|
|
82
|
- The pest that consumes the egg plant is within.
- Ihe na ata ańara dị n’ime ańara.
|
|
83
|
- One more slice, and yet another helping . All comes from the cow.
- Beta anụ, beta anụ bụ kwa nụ n'arụ efi.
|
|
84
|
- The dog said “the reason why I trail the fat bellied is because they are
sure to either pass some faeces or vomit”.
- Nkịta sị na ihe o ji eso onye afọ ukwu bụ na
ọ nyụghị anyụ, ọ gbọọ
agbọọ.
|
|
85
|
- A calamity that brings down a great man will annihilate a pauper.
- Ọnwu gburu dike nweta ọfeke, ọ dọgbue ya
adọgbu.
|
|
86
|
- Whoever take a child’s belonging and lifts his arm high will eventually
lower his arm out of tiredness.
- Onye ji ihe nwata wegoro aka elu,
ike gwụ ya, ọ wetue aka ahụ.
|
|
87
|
- You can only forebear a king for so long before you speak out. How be it
with a basket covering your head.
- A gbakata Eze nkịtị, ekpudo nkata n'isi gwa ya okwu.
|
|
88
|
- When an animal runs badly, it gets a bad gun shot as well.
- Anụ gbaa ajọ ọsọ, agba ya ajọ egbe.
|
|
89
|
- The calamity that ultimately kills a dog would prevent it from
perceiving the smell of feces.
- Ọnwụ n’egbu nwankịta anaghị ekweya anụ isi
nsị.
|
|
90
|
- The fly that has no counsellor would end up in the grave with the corps.
- Ijiji enweghị onye ndụmọdụ na eso ozu aba n’ili.
|
|
91
|
- If the ear refuses to heed warning, when the head is cut off the ear
goes with it.
- A n'agwa ntị ma ntị anụghi, egburu isi ntị esoro
|
|
92
|
- When people urinate on the same spot it foams.
- A nyụkọ mamiri ọnụ, ọ gba
ọfụfụ.
|
|
93
|
- The chicken that walks crooked is seen by a crooked eye.
- Ọkụkọ n'aga wara wara, anya n'aga wara n'ahụ ya.
|
|
94
|
- The Tortoise said “if war breaks out I will trample the pregnant woman
to death”. When war broke out, the people with legs crushed the pregnant
woman but the Tortoise was
arrested.
- Mbe si na agha daa ọ zọgbuọ nwanyi di ime. Agha daa
ndi nwere ụkwụ azọgbuo nwanyi dị ime, ma
kpụrụ mbe.
|
|
95
|
- A child that is consuming akara (Bean cake) is consuming his money.
- Nwata na-ata akara na ata ego ya.
|
|
96
|
- If a child tries to tie wrapper before maturity the wind will blow him
away along with the wrapper.
- Nwata etoghị eto wara ọgọdọ, ikuku eburu ya buru
ọgọdọ.
|
|
97
|
- If an animal escapes the hunter today, tomorrow is yet another day to
hunt.
- Anuụ gbala taa, echi bụ nta.
|
|
98
|
- The crab said “I swam in great and mighty bodies of water but got my
eyes boiled off in an old lady’s pot.”
- Nshịkọ si na ya gwuru iyi ukwu gwukwa iyi nta, ma ite agadi
nwanyị sụkpọrọ ya anya.
|
|
99
|
- What was being looked for in the upper shelf was found in the lower
shelve.
- Ihe ana achọ na uko elu ka ahụrụ na uko ala.
|
|
100
|
- When the breadfruits gets to its ripe season it will fall.
- Ụkwa ruo ọge ya ọ daa.
|
|
101
|
- The weevil in the fish is fish
- Nje dị na azụ bụ azụ.
|
|
102
|
- A drunken fowl has not met a mad fox.
- Ọkụkọ mmanya na-egbu ezubeghị
mmanwụlụ ara na-ayi.
|
|
103
|
- If an egg cracks a kernel, the stone is put to shame.
- Akwa ọkụkọ tie akị, ihere emee mkpume.
|